Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:27

[1] O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile.

[2] Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.

[3] Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”

[4] Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị.

[5] Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,

[6] ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.

[7] E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.

[8] Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.

[9] Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.

[10] Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.

[11] Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị? Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.

[12] Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.

[13] O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.

[14] Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.

[15] Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.

[16] Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.

[17] Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.

Abụ Ọma — Chapters