Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:52

[1] O Onyenwe anyị, cheta Devid, nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.

[2] Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:

[3] “Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m,

[4] agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,

[5] tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”

[6] Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.

[7] “Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.

[8] ‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.

[9] Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ ”

[10] Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.

[11] Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,

[12] ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”

[13] Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;

[14] “Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.

[15] Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.

[16] Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.

[17] “Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.

[18] Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”

Abụ Ọma — Chapters