[1] Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.
[2] Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.
[3] Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
[4] Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso,
[5] ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
[6] Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
[7] Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.
[8] Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Sela
[9] O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
[10] O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
[11] Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
[12] Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
[13] Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.
[14] Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.