Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:48

[1] Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.

[2] Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

[3] Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?

[4] Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela

[5] O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.

[6] Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

[7] Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke, Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.

[8] Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

[9] Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, ndị ukwu bụ naanị ụgha; ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; ha niile bụ naanị otu nkuume.

[10] Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi.

[11] Chineke ekwuola otu ihe, ihe abụọ ka m nụrụ: “Na gị, O Chineke, dị ike,

[12] na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.”

Abụ Ọma — Chapters