[1] Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.
[2] Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.
[3] Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.
[4] Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.
[5] Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.
[6] Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.
[7] Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
[8] Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.
[9] O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
[10] Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.
[11] Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.
[12] Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.
[13] Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.
[14] Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.
[15] O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
[16] Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”
[17] Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
[18] Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.
[19] Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.
[20] Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.
[21] O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.
[22] Bịa ọsịịsọ inyere m aka Onyenwe m na Onye nzọpụta m.