Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:10

[1] Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

[2] Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke.

[3] Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

[4] Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.

[5] Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.

[6] Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye, ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.

[7] A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!

Abụ Ọma — Chapters