Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 7:42

[1] Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.

[2] Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;

[3] ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.

[4] Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.

[5] O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,

[6] ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.

[7] Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.

[8] Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.

[9] Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.

[10] Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.

[11] Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.

[12] Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.

[13] O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.

[14] O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.

[15] Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.

[16] O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.

[17] Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.

[18] Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.

[19] Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?

[20] Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”

[21] Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.

[22] Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.

[23] Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.

[24] O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.

[25] Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.

[26] O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.

[27] O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.

[28] O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.

[29] Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.

[30] Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,

[31] mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.

[32] Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.

[33] O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.

[34] Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.

[35] Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.

[36] Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.

[37] Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.

[38] Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.

[39] Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.

[40] Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.

[41] Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.

[42] Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;

[43] nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.

[44] O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.

[45] O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.

[46] O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.

[47] O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.

[48] O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.

[49] O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.

[50] O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.

[51] O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.

[52] Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.

[53] O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.

[54] Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.

[55] Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.

[56] Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.

[57] Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.

[58] Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.

[59] Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.

[60] Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.

[61] O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.

[62] O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.

[63] Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;

[64] E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.

[65] Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta.

[66] Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.

[67] Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem;

[68] ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.

[69] O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

[70] Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ;

[71] o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ.

[72] Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.

Abụ Ọma — Chapters