Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 4:29

[1] Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;

[2] nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.

[3] Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.

[4] Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.

[5] Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:

[6] Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.

[7] Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.

[8] Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.

[9] Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.

[10] Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.

[11] Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.

[12] Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;

[13] ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.

[14] Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.

[15] Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.

[16] Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;

[17] nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.

[18] Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[19] Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.

[20] Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.

[21] Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.

[22] Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.

[23] Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;

[24] ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.

[25] Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.

[26] Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị.

[27] Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.

[28] Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;

[29] ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.

[30] Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.

[31] Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.

[32] Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;

[33] ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.

[34] Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.

[35] Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,

[36] ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.

[37] Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo.

[38] Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.

[39] Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.

[40] Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.

Abụ Ọma — Chapters