Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:12

[1] Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,

[2] ma ndị dị ala ma ndị dị elu, ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.

[3] Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.

[4] Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.

[5] Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,

[6] ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.

[7] O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,

[8] nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,

[9] nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ.

[10] Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.

[11] Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi, ebe obibi ha ruo ọgbọ niile nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.

[12] Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ, dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.

[13] Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela

[14] Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.

[15] Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela

[16] Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,

[17] nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.

[18] Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,

[19] ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.

[20] Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.

Abụ Ọma — Chapters