Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:19

[1] Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?

[2] Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.

[3] Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.

[4] Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.

[5] Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile.

[6] Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”

[7] Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.

[8] Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.

[9] Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.

[10] Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha.

[11] Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”

[12] Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.

[13] Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?

[14] Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.

[15] Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.

[16] Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.

[17] O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,

[18] Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.

Abụ Ọma — Chapters