Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:50

[1] Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela

[2] Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.

[3] Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.

[4] Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela

[5] Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.

[6] Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.

[7] Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Abụ Ọma — Chapters