Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:59

[1] O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga.

[2] I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.

[3] Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.

[4] Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.

[5] Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.

[6] Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri;

[7] ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.

[8] Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela

[9] Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.

[10] I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.

[11] Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.

[12] I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị.

[13] I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.

[14] I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.

[15] Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu, ihere m na-ekpuchikwa m ihu,

[16] mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.

[17] Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.

[18] Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.

[19] Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.

[20] Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,

[21] ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?

[22] Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.

[23] O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra? Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi.

[24] Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị, ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị?

[25] E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu, ahụ anyị rapara nʼaja

[26] Bilie ma nyere anyị aka; gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.

Abụ Ọma — Chapters