Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:58

[1] Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị.

[2] Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

[3] Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.

[4] Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe.

[5] Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,

[6] onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya?

[7] Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;

[8] ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.

[9] Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.

Abụ Ọma — Chapters