Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:51

[1] A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,

[2] a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,

[3] mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;

[4] idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,

[5] ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.

[6] Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.

[7] Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.

[8] Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

Abụ Ọma — Chapters