Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:06

[1] Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!

[2] Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!

[3] Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.

[4] Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela

[5] Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!

[6] O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.

[7] Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela

[8] Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;

[9] O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.

[10] Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.

[11] Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.

[12] I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.

[13] Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị

[14] nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.

[15] Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela

[16] Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.

[17] Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.

[18] Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;

[19] ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.

[20] Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!

Abụ Ọma — Chapters