Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:36

[1] Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!

[2] Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.

[3] Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Abụ Ọma — Chapters