[1] O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.
[2] I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela
[3] Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
[4] Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.
[5] Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?
[6] Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?
[7] O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị.
[8] Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.
[9] Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
[10] Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ.
[11] Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
[12] Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.
[13] Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.