Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:25

[1] O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.

[2] I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela

[3] Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.

[4] Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.

[5] Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?

[6] Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?

[7] O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị.

[8] Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.

[9] Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.

[10] Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ.

[11] Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.

[12] Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.

[13] Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Abụ Ọma — Chapters