Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:58

[1] O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m.

[2] O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m.

[3] Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela

[4] Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.

[5] Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.

[6] Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.

[7] Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

Abụ Ọma — Chapters