Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:46

[1] Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.

[2] Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.

[3] Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.

[4] Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”

[5] Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.

[6] Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.

[7] Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

[8] Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

[9] ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

[10] Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”

[11] nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”

[12] Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?

[13] Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

[14] Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.

[15] Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.

[16] O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.

[17] Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

[18] Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

[19] nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.

Abụ Ọma — Chapters