[1] Toonu Onyenwe anyị. Toonu aha Onyenwe anyị, toonu ya, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile,
[2] unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị, nʼime ogige ụlọ Chineke anyị.
[3] Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
[4] Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya, ọ họpụtala Izrel ka ọ bụrụ ihe oke ọnụahịa nke aka ya.
[5] Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu, na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile.
[6] Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile.
[7] Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
[8] O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ.
[9] O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt, megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi.
[10] O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha.
[11] Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait, na Ọg eze Bashan, na ndị eze niile dị na Kenan.
[12] O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya, nye ya ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
[13] O Onyenwe anyị, aha gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi a maara aha gị ruo ọgbọ niile.
[14] Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekpepụta ndị ya. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya.
[15] Chi ndị mba ọzọ bụ arụsị e jiri aka kpụọ, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.
[16] Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ.
[17] Ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ọ dịkwaghị nkuume dị nʼime ọnụ ha.
[18] Ndị na-eme ha ga-adị ka ha. Ọ bụkwa otu a ka ndị na-atụkwasị ha obi ga-adị.
[19] Ndị Izrel, toonu Onyenwe anyị. Unu ndị ụlọ Erọn, toonu Onyenwe anyị.
[20] Unu ndị ụlọ Livayị, toonu Onyenwe anyị; unu ndị na-atụ egwu ya, toonu Onyenwe anyị.
[21] Ka otuto dịrị Onyenwe anyị site na Zayọn, nye onye ahụ na-ebi na Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.