Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 16:01

[1] Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.

[2] Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.

[3] Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.

[4] I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi.

[5] Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile!

[6] Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.

[7] Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

[8] Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. ב Bet

[9] Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.

[10] Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

[11] Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.

[12] Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile.

[13] Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị.

[14] Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.

[15] Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.

[16] Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. ג Gimel

[17] Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi.

[18] Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.

[19] Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile.

[20] Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ.

[21] Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.

[22] Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.

[23] Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.

[24] Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. ד Dalet

[25] Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.

[26] Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị.

[27] Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.

[28] Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.

[29] Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara.

[30] Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.

[31] O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m.

[32] Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. ה He

[33] O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.

[34] Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.

[35] Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.

[36] Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.

[37] Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.

[38] Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.

[39] Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

[40] Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. ו Waw

[41] O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;

[42] mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.

[43] Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.

[44] Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi.

[45] Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

[46] Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,

[47] nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.

[48] Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. ז Zayin

[49] Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya.

[50] Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.

[51] Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.

[52] O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi.

[53] Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ.

[54] Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ.

[55] Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị.

[56] Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi. ח Het

[57] O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.

[58] Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.

[59] Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.

[60] Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.

[61] A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị.

[62] Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.

[63] Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.

[64] O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile. ט Tet

[65] Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.

[66] Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.

[67] Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.

[68] I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile.

[69] Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.

[70] Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.

[71] Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.

[72] Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. י Yod

[73] Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.

[74] Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.

[75] O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.

[76] Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.

[77] Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.

[78] Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

[79] Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.

[80] Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. כ Kap

[81] Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.

[82] Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”

[83] Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.

[84] Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?

[85] Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.

[86] Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.

[87] Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.

[88] Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. ל Lamed

[89] O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.

[90] Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.

[91] Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.

[92] A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.

[93] Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.

[94] Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

[95] Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

[96] Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. מ Mem

[97] O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.

[98] Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile.

[99] Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.

[100] Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.

[101] Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi

[102] Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.

[103] Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!

[104] A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. נ Nun

[105] Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

[106] Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.

[107] Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.

[108] O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.

[109] Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị.

[110] Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.

[111] Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.

[112] Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. ס Samek

[113] Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

[114] Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.

[115] Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!

[116] Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa.

[117] Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.

[118] Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.

[119] Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.

[120] Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. ע Ayin

[121] Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.

[122] Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.

[123] Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.

[124] Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.

[125] Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.

[126] O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị.

[127] Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,

[128] nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. פ Pe

[129] Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.

[130] Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

[131] Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.

[132] Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

[133] Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.

[134] Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.

[135] Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.

[136] Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. צ Tsade

[137] O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi.

[138] Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi.

[139] Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.

[140] Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.

[141] Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.

[142] Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu.

[143] Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.

[144] Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. ק Kwof

[145] Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.

[146] Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.

[147] Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị.

[148] Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.

[149] Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.

[150] Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.

[151] Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.

[152] Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. ר Resh

[153] Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.

[154] Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.

[155] Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.

[156] O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.

[157] Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.

[158] Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.

[159] Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.

[160] Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. ש Sin na Shin

[161] Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.

[162] Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.

[163] Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

[164] Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.

[165] Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.

[166] Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, na-agbasokwa iwu gị niile.

[167] Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.

[168] Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. ת Taw

[169] Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị.

[170] Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị.

[171] Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.

[172] Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

[173] Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.

[174] Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m.

[175] Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.

[176] Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

Abụ Ọma — Chapters