Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:59

[1] Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.

[2] Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.

[3] Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.

[4] Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.

[5] Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.

[6] Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,

[7] iji bọọrọ mba niile ọbọ taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,

[8] iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,

[9] imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.

Abụ Ọma — Chapters