Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:53

[1] Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

[2] Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

[3] Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

[4] O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.

[5] Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel.

Abụ Ọma — Chapters