Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:14

[1] Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.

[2] O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.

[3] Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.

[4] Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”

[5] “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”

[6] Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.

[7] O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

[8] Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.

Abụ Ọma — Chapters