Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:26

[1] Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.

[2] Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.

[3] Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.

[4] Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha na omume ha kwesiri; kwụghachi ha maka ihe aka ha mere, ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.

[5] Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ, ọ ga-akwada ha nʼala, ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.

[6] Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

[7] Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

[8] Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya, ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.

[9] Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị; buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.

Abụ Ọma — Chapters