Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:32

[1] Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?

[2] Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.

[3] Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.

[4] Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,

[5] nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.

[6] O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!

[7] Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.

[8] Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.

[9] Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.

[10] Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.

[11] Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”

Abụ Ọma — Chapters