Listen to this chapter • 1:00
[1] Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
[2] Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
[3] Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
[4] Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị.
[5] Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe; ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.
[6] Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Abụ Ọma — Chapters
11:0021:2631:0041:1351:4261:2272:1281:1492:24102:19111:06121:14130:49141:10150:51161:23171:59185:49192:02201:06211:37223:39230:51241:15252:21261:21272:01281:26291:17301:29313:16321:49332:27342:21353:50361:47374:29382:18391:55402:35411:41422:00430:51442:59452:35461:35471:11481:47492:12502:37512:16521:32531:13540:58552:59561:54571:47581:32592:36601:49611:04621:48631:19641:15651:52662:06670:50684:38694:17700:52713:06722:30732:57742:41751:27761:30772:23787:42791:56802:22812:01821:02832:02841:52851:25862:14870:56882:12895:40902:27911:55921:42930:58942:29951:17961:40971:28981:11991:161000:421011:161022:571032:191044:001054:141064:581074:391081:291093:191101:041111:141121:211130:581140:591151:481161:461170:231182:4411916:011200:451210:531220:581230:411240:511250:531260:511270:501280:441290:561300:561310:381321:521330:361340:251352:161362:291371:111381:131392:401401:441411:321421:061431:401442:111452:121461:201472:041481:331490:591500:45