[1] Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
[2] Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
[3] Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
[4] Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela
[5] Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
[6] Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
[7] Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
[8] Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
[9] Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
[10] Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
[11] Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.