Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:30

[1] A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.

[2] Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn

[3] Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela

[4] Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.

[5] A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu.

[6] Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.

[7] Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?

[8] I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu,

[9] mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela

[10] Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto, ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.

[11] Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.

[12] Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.

Abụ Ọma — Chapters