Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:16

[1] Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

[2] Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m.

[3] Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.

[4] Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

[5] Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.

[6] Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.

[7] Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m.

[8] Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo Onyenwe anyị.

Abụ Ọma — Chapters