Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:57

[1] Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.

[2] Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.

[3] Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.

[4] Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m.

[5] Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.

[6] Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.

[7] Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.

[8] Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.

[9] Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m

[10] nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.

[11] Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.

[12] Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

[13] Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.

[14] Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.

[15] Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.

[16] Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.

[17] Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.

[18] Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:

[19] “Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,

[20] ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”

[21] Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem,

[22] mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

[23] O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.

[24] Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

[25] Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.

[26] Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.

[27] Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.

[28] Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”

Abụ Ọma — Chapters