[1] Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
[2] Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
[3] Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
[4] Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.
[5] Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.
[6] Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
[7] Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
[8] Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
[9] Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
[10] Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
[11] Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
[12] O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị.
[13] Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
[14] Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
[15] Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.
[16] Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
[17] Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
[18] Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.
[19] O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
[20] O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!