[1] Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara Zayọn.
[2] Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
[3] Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
[4] Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
[5] Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya.
[6] Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
[7] Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
[8] Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị,
[9] onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara tụpịa ha nʼelu nkume.