[1] Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
[2] Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
[3] Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
[4] Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
[5] Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
[6] Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
[7] Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
[8] Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
[9] Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
[10] O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
[11] Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
[12] Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
[13] Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
[14] Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
[15] Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
[16] Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
[17] Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
[18] O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
[19] Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
[20] Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
[21] Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
[22] O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
[23] Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.