[1] “Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
[2] Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
[3] otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
[4] Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
[5] Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
[6] “Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
[7] O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
[8] Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
[9] Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.
[10] E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
[11] “Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
[12] A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?
[13] Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
[14] nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
[15] ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
[16] Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
[17] “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
[18] i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
[19] Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
[20] Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?
[21] Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”