Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:47

[1] Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.

[2] Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.

[3] Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.

[4] Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.

[5] Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.

[6] Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara.

[7] Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’

[8] Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.

[9] Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.

[10] “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.

[11] Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.

[12] Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.

[13] Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’

[14] Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.

[15] “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha.

[16] M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?

[17] Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,

[18] nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.

[19] Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.

[20] Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.

[21] Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.

[22] Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

Job — Chapters