Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:46

[1] “Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.

[2] Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.

[3] Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?

[4] Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ.

[5] Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.

[6] Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.

[7] “Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.

[8] A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,

[9] mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.

[10] Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.

[11] Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,

[12] otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.

[13] “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m.

[14] Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.

[15] Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị, agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.

[16] Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m.

[17] A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.

[18] “Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,

[19] dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.

[20] Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.

[21] Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a; ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.

[22] Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”

Job — Chapters