Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 4:06

[1] Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:

[2] “Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi? Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?

[3] Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka, maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?

[4] Ma ị na-eleda ezi omume anya na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.

[5] Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa; ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.

[6] Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m, egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.

[7] “Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ? A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?

[8] Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke? Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?

[9] Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?

[10] Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.

[11] Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?

[12] Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,

[13] nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?

[14] “Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?

[15] Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,

[16] ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.

[17] “Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,

[18] bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,

[19] bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.

[20] Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ, bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.

[21] Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị, mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.

[22] O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.

[23] Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele; ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.

[24] Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu, nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.

[25] Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.

[26] O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.

[27] “Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,

[28] ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị.

[29] Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.

[30] Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.

[31] Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.

[32] Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ

[33] Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

[34] Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.

[35] Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume; naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”

Job — Chapters