[1] Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
[2] O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
[3] Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
[4] Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[5] Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
[6] Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
[7] Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[8] Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
[9] Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
[10] Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[11] Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
[12] Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
[13] Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[14] Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
[15] Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
[16] Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[17] Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
[18] Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
[19] Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[20] Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
[21] Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
[22] Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[23] Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
[24] Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
[25] Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
[26] Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[27] Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
[28] Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
[29] Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
[30] Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
[31] Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
[32] Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.