Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:55

[1] Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.

[2] Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.

[3] Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,

[4] “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”

[5] Ụmụ Het zara Ebraham sị,

[6] “Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”

[7] Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,

[8] sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,

[9] ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”

[10] Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo

[11] sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”

[12] Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,

[13] ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”

[14] Efrọn zara Ebraham,

[15] “Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”

[16] Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.

[17] Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,

[18] ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.

[19] Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.

[20] Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.

Jenesis — Chapters