[1] Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
[2] Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
[3] Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama.
[4] Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim.
[5] (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
[6] Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
[7] Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
[8] Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
[9] Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
[10] Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.
[11] Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala,
[12] na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
[13] Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
[14] ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.
[15] Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,
[16] ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
[17] ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
[18] ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara,
[19] oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
[20] Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
[21] A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
[22] Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
[23] Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek.
[24] Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba.
[25] Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
[26] Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,
[27] Hadoram, Ụzal, Dikla,
[28] Obal, Abimael, Sheba,
[29] Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
[30] Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
[31] Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
[32] Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.