[1] Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera.
[2] Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya.
[3] Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.
[4] Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa.
[5] Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”
[6] Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera.
[7] Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.”
[8] Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.
[9] Ya mere, Abimelek kpọrọ Aịzik sị, “Nwunye gị ka ọ bụ nʼezie. Gịnị mere i ji gwa anyị na ọ bụ nwanne gị nwanyị?” Aịzik zara ya, “Ọ bụ nʼihi na m chere na-enwere ike igbu m nʼihi ya.”
[10] Abimelek sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Otu nwoke nʼetiti anyị gaara akpọrọ nwunye gị dinaa ya. Ị gaara esi otu a wetara anyị ikpe ọmụma.”
[11] Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.”
[12] Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya.
[13] Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama.
[14] O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya.
[15] Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ.
[16] Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.”
[17] Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ.
[18] O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ.
[19] Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.
[20] Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya.
[21] Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna.
[22] O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, Onyenwe anyị enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.”
[23] O sitere nʼebe ahụ kwapụ gaa Bịasheba.
[24] Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya, sị ya, “Abụ m Chineke nna gị Ebraham. Atụla egwu, nʼihi na anọnyere m gị, aga m agọzi gị, mụbaa ọnụọgụgụ ụmụ ụmụ gị nʼihi ohu m Ebraham.”
[25] Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri.
[26] Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik.
[27] Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?”
[28] Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ
[29] na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”
[30] Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa.
[31] Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo.
[32] Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.”
[33] Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba ruo taa.
[34] Mgbe Ịsọ gbara iri afọ anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiri, onye Het. Ọ lụkwara Basemat nwa Elọn, onye Het.
[35] Ha ghọrọ Aịzik na Ribeka ihe ọnọdụ obi ilu.