Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 5:25

[1] Benjamin mụtara ụmụ ndị ikom ise. Aha ha nʼusoro dịka e si mụọ ha bụ: Bela nke mbụ, nke abụọ Ashbel, nke atọ Ahara,

[2] nke anọ Noha, na nke ise Rafa.

[3] Ndị ikom Bela mụrụ bụ Aada, Gera, Abihud,

[4] Abishua, Neeman, Ahoa,

[5] Gera, Shefufan na Huram.

[6] Ụmụ Ehud ndị bụ ndịisi ezinaụlọ na Geba, ndị bụkwa ndị e si na Geba chụpụ mee ka ha gaa biri na Manahat bụ ndị a:

[7] Neeman, Ahija na Gera, onye chụpụrụ ha na onye bụkwa nna Ụza na Ahihud.

[8] A mụtara Shaharaim ụmụ ndị ikom na Moab mgbe ọ gbachara ndị nwunye ya abụọ bụ Hushim na Baara alụkwaghị m.

[9] Nwunye ya Hodesh mụtara Jobab, Zibịa, Mesha, Malkam,

[10] Jeuz, Sakia na Miama. Ndị a bụ ụmụ ya ndị ikom, ndị bụkwa ndịisi ezi.

[11] Tupu ọ chụpụ nwunye ya Hushim, ọ mụtaara ya Abaịtub, na Elpaal.

[12] Elpaal mụrụ ndị a: Eba, Misham, Shemed (onye wuru obodo Ono na Lod, na obodo nta gbara ha gburugburu).

[13] Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Beriya, na Shema, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị bi nʼAijalon. Ọ bụ ha chụpụrụ ndị Gat site nʼobodo ahụ.

[14] Beriya mụrụ Ahio, Shashak, Jeremot,

[15] Zebadaya, Arad, Eda,

[16] Maikel, Ishpa na Joha, ndị a bụ ụmụ ndị ikom Beriya.

[17] Zebadaya, Meshulam, Hizki, Heba,

[18] Ishmerai, Izlaya na Jobab bụ ụmụ Elpaal.

[19] Jakim, Zikri, Zabdi,

[20] Elienai, Ziletai, Eliel,

[21] Adaya, Beraya na Shimrat bụ ụmụ Shimei.

[22] Ishpan, Eba, Eliel,

[23] Abdon, Zikri, Hanan,

[24] Hananaya, Elam, Antotija,

[25] Ifdeya na Penuel bụ ụmụ ndị ikom Shashak.

[26] Jeroham mụrụ Shamsherai, Sheharaya, Atalaya,

[27] Jaareshaya, Ịlaịja na Zikri bụ ụmụ ndị ikom Jeroham.

[28] Ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị ndu, ndị bi na Jerusalem, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.

[29] Jeiel nna Gibiọn biri na Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Maaka.

[30] Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,

[31] Gedoa, Ahio na Zeka

[32] na Miklot, onye bụ nna Shimea. Ha onwe ha bikwa ndị ụmụnna ha nso na Jerusalem.

[33] Nea mụrụ Kish, nna Sọl. Ma Sọl mụrụ Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.

[34] Jonatan mụrụ nwa nwoke a na-akpọ Merib-Baal, nna Maịka.

[35] Ụmụ Maịka mụrụ bụ, Piton, Melek, Tarea na Ehaz.

[36] Ehaz amụọ Jehoada nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.

[37] Moza mụrụ Binea, nna Rafa, nna Eleasa, nna Azel.

[38] Azel mụrụ ụmụ ndị ikom isii ndị a: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.

[39] Eshek nwanne nwoke Azel mụrụ ndị ikom atọ: Ụlam, ọkpara ya na Jeush, na Elifelet.

[40] Ụmụ Ụlam bụ dike na dimkpa ndị a zụrụ ịgba ụta. Ọnụọgụgụ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha dị otu narị na iri mmadụ ise, 150. Ha niile sikwa nʼebo Benjamin.

1 Ihe E Mere — Chapters