Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 8:25

[1] Adam, Set, Enọsh,

[2] Kenan, Mahalalel, Jared,

[3] Enọk, Metusela, Lamek, na Noa.

[4] Ụmụ Noa bụ Shem, Ham, na Jafet.

[5] Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.

[6] Ụmụ ndị ikom Goma bụ Ashkenaz, na Rifat, na Togama.

[7] Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim, na Rodanim.

[8] Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.

[9] Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama, na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.

[10] Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.

[11] Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,

[12] ndị Patrus, na ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.

[13] Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,

[14] ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,

[15] ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,

[16] ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat.

[17] Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. Ụmụ Aram bụ Uz, Hul, Geta na Meshek.

[18] Apakshad bụ nna Shela; Shela bụrụ nna Eba.

[19] Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa; aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.

[20] Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,

[21] Hadoram, Ụzal, Dikla,

[22] Obal, Abimael, Sheba,

[23] Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.

[24] Shem, Apakshad, Shela,

[25] Eba, Peleg, Reu,

[26] Serug, Nahọ, Tera

[27] na Ebram, ya bụ Ebraham.

[28] Ụmụ Ebraham mụrụ bụ Aịzik na Ishmel.

[29] Ndị a bụ ụmụ ụmụ ha: Nebaiot (ọkpara Ishmel), Keda, Adbel, Mibsam,

[30] Mishma, Duma, Masa, Hadad, Tema,

[31] Jetua, Nafish na Kedema. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ishmel.

[32] Ketura, iko nwanyị Ebraham, mụtaara ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. Jokshan mụtara ndị a: Sheba na Dedan.

[33] Ụmụ ndị ikom Midian bụ: Efaa, Efe, Hanok, Abida na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Ketura.

[34] Ebraham mụtara Aịzik. Ụmụ ndị ikom Aịzik bụ Ịsọ na Izrel.

[35] Ịsọ mụrụ ndị a: Elifaz, Reuel, Jeush, Jalam na Kora.

[36] Ụmụ Elifaz bụ Teman, Ọmaa, Zefi, Gatam na Kenaz, na Amalek, site na Timna.

[37] Ụmụ ndị ikom Reuel bụ: Nahat, Zera, Shama, na Miza.

[38] Ụmụ ndị ikom Sia bụ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, Dishọn, Eza na Dishan.

[39] Ụmụ ndị ikom Lotan bụ Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.

[40] Ụmụ ndị ikom Shobal bụ Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam. Zibiọn mụrụ Aịa na Ana.

[41] Ana mụrụ Dishọn. Ụmụ Dishọn bụ Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.

[42] Ụmụ ndị ikom Eza bụ Bilhan, na Zaavan, na Akan. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ Uz na Aran.

[43] Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze nke ha. Bela nwa Beoa, onye aha obodo ya bụ Dinhaba.

[44] Mgbe Bela nwụrụ Jobab nwa Zera, onye Bozra nọchiri ya dịka eze.

[45] Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.

[46] Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị agha Midia nʼọzara Moab, ghọrọ eze. Isi obodo ya bụ Avit.

[47] Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.

[48] Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.

[49] Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa, nọchiri ya dịka eze.

[50] Mgbe Baal-Hanan nwụrụ, Hadad nọchiri ya dịka eze. Akpọrọ isi obodo ya Pai. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred, nwa nwa Mezahab.

[51] Hadad mesịrị nwụọkwa. Ndịisi ọnụmara nʼEdọm bụ Timna, Alva, Jetet,

[52] Oholibama, Elaa, Pinon,

[53] Kenaz, Teman, Mibza,

[54] Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm.

1 Ihe E Mere — Chapters