[1] Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn,
[2] Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.
[3] Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.
[4] Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise.
[5] Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
[6] Zera mụrụ: Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ.
[7] Ekan nwa Kami, bụ onye ahụ tinyere ndị Izrel na nsogbu, site nʼihe o mere nke gbasara ihe e doro nsọ.
[8] Etan mụrụ Azaraya.
[9] Hezrọn mụtara Jerameel, Ram na Kaleb.
[10] Ram mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Nashọn onyendu a maara ama na Juda.
[11] Nashọn mụrụ Salma, Salma amụọ Boaz.
[12] Boaz amụta Obed, Obed amụọ Jesi.
[13] Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ Eliab; nke abụọ bụ Abinadab, nke atọ bụ Shimea.
[14] Nke anọ bụ Netanel, nke ise bụ Radai,
[15] nke isii Ozem, nke asaa Devid.
[16] Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya, ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel.
[17] Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.
[18] Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a Jesha, Shobab na Adọn.
[19] Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
[20] Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
[21] Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
[22] Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
[23] Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.
[24] Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.
[25] Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.
[26] Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.
[27] Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a: Maaz, na Jamin, na Eka.
[28] Ụmụ Onam mụrụ bụ Shamai, na Jada. Shamai mụkwara Nadab, na Abishua.
[29] Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid.
[30] Ụmụ Nadab mụrụ bụ Seled, na Apaim. Seled nwụrụ na-amụtaghị nwa ọbụla.
[31] Ma Apaim mụtara Ishi. Ishi mụrụ Sheshan, Sheshan amụtakwa Alai.
[32] Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ, Jeta na Jonatan. Jeta amụtaghị nwa ọbụla,
[33] ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Pelet na Zaza. Ndị a bụ ụmụ Jerameel.
[34] Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke. O nwere otu ohu bụ onye Ijipt, aha ya bụ Jaha.
[35] O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai.
[36] Atai mụrụ Netan, Netan mụrụ Zabad,
[37] Zabad amụọ Eflal. Nwa Eflal bụ Obed,
[38] ma Obed mụrụ Jehu. Jehu amụọ Azaraya.
[39] Azaraya bụ nna Helez, Helez mụrụ Eleasa.
[40] Eleasa mụrụ Sismai, Sismai amụọ Shalum.
[41] Shalum bụ nna Jekamaya, ebe Jekamaya mụrụ Elishama.
[42] Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ Mesha onye bụ ọkpara ya, nna Zif, onye mụrụ Maresha nna Hebrọn.
[43] Hebrọn mụrụ ndị a: Kora, Tapụọa, Rekem na Shema.
[44] Shema mụrụ Raham, onye bụ nna Jokean. Rekem mụrụ Shamai.
[45] Ọkpara Shamai bụ Maon, onye mụrụ Bet Zoa.
[46] Efaa, iko nwanyị Kaleb, mụtaara ya Haran, Moza na Gazez. Haran mụtakwara nwa ọ kpọrọ aha ya Gazez.
[47] Jadia mụtara ndị ikom ndị a: Regem, Jotam, Gesham, Pelet, Efaa na Shaaf.
[48] Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a: Sheba na Tiahana,
[49] ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna, Sheva nna Makbena, tinyere Gibea. Aha nwa nwanyị Kaleb mụtara bụ Aksa.
[50] Ndị a bụ ụmụ Kaleb. Ụmụ Hua, ọkpara Efrata mụrụ bụ, Shobal, nna Kiriat Jearim,
[51] Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea.
[52] Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ Haroe, onye mụrụ ọkara ndị ikwu Menuhot.
[53] Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
[54] Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.
[55] Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.