[1] Hiram bụ eze Taịa zitere Devid ndị ozi, na ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-edo nkume, ka ha nyere Devid aka iwu ụlọeze ya. O nyekwara ya osisi sida o ji ewu ụlọ ahụ.
[2] Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel, na ebuliela alaeze ya elu nke ukwuu nʼihi ndị ya Izrel.
[3] Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
[4] Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
[5] Ibha, Elishua, Elpelet,
[6] Noga, Nefeg, Jafia,
[7] Elishama, Beeliada na Elifelet.
[8] Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha.
[9] Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim.
[10] Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”
[11] Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.
[12] Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.
[13] Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ.
[14] Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
[15] Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
[16] Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.
[17] Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.