[1] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
[2] Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
[3] Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
[4] Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
[5] Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
[6] “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.
[7] Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.
[8] Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
[9] Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
[10] Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị,
[11] “Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
[12] Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
[13] Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
[14] Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
[15] Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
[16] Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha: Geshọn, Kohat na Merari. Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
[17] Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha, bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
[18] Ụmụ ndị ikom Kohat bụ, Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
[19] Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi. Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
[20] Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
[21] Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
[22] Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
[23] Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
[24] Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
[25] Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
[26] Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.”
[27] Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.
[28] Otu ụbọchị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼIjipt,
[29] ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.”
[30] Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”