Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 6:20

[1] “Ndị a bụ iwu ị ga-edebe nʼihu ha.

[2] “Ọ bụrụ na ị goro ohu onye Hibru, ọ ga-agbara gị odibo afọ isii. Ma nʼafọ nke asaa, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya laakwa nʼakwụghị ụgwọ ọbụla.

[3] Ọ bụrụ na sọọsọ ya bịara, sọọsọ ya ga-ala, ma ọ bụrụ na o nwere nwunye tupu ọ bụrụ ohu, ya na nwunye ya ga-eso ala.

[4] Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.

[5] “Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’

[6] mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.

[7] “A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala.

[8] Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ.

[9] Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka nwa ya nwoke lụọ ya dịka nwunye ya, ọ ga-emeso ya dịka omenaala si kwado e si emeso ndị bụ nwaada.

[10] Ọ bụrụkwa na ọ lụta ya dịka nwunye nke aka ya, mesịakwa lụta nwunye ọzọ, ọ gaghị akwụsị inye ya uwe maọbụ ihe oriri. Ọ gaghị agọnarịkwa ya ihe ọbụla kwesiri ya dịka nwunye.

[11] Ọ bụrụ na o mereghị ohu nwanyị a ihe ndị a, nwanyị a pụrụ ịhapụ ya gaara onwe ya na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Mgbe ahụ, ọ ga-enwerekwa onwe ya.

[12] “Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.

[13] Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ.

[14] Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.

[15] “Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.

[16] “Onye ọbụla tọọrọ mmadụ ibe ya, ma o rere ya nʼahịa, maọbụ na a chọpụtara ya nʼaka ya, a ga-eme ka onye dị otu a nwụọ.

[17] “Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.

[18] “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya,

[19] ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma.

[20] “Ọ bụrụ na ohu ọbụla anwụọ site nʼihe otiti nke onyenwe ya tiri ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, a ga-adọ onyenwe ya aka na ntị site nʼinye ya ntaramahụhụ.

[21] Otu ọ dị, ọ bụrụ na ohu ahụ dị ndụ nʼụbọchị mbụ, maọbụ nʼụbọchị nke abụọ, a gaghị enye onyenwe ya ntaramahụhụ nʼihi na ohu ahụ bụ akụ ya.

[22] “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri.

[23] Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ.

[24] Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ.

[25] Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti.

[26] “Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.

[27] Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla etipụ eze ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya nʼihi eze ya nke e tipụrụ.

[28] “Ọ bụrụ na ehi ejiri mpi ya sọda mmadụ si otu a mee ka onye ahụ nwụọ, a ga-atụgbu ehi ahụ na nkume. Mmadụ ọbụla agaghị erikwa anụ ehi ahụ. Ma a ga-agụ onyenwe ehi ahụ dịka onye ikpe na-amaghị.

[29] Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ.

[30] Ma ọ bụrụ na ndị nwe mmadụ achọọ ka a kwụọ ha ụgwọ kama igbu onyenwe ehi ahụ, ndị ikpe ga-ekpebi ego ole onyenwe ehi ga-akwụ ha.

[31] Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla.

[32] Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ.

[33] “Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,

[34] onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.

[35] “Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ.

[36] Ọ bụrụ na amaara na oke ehi ahụ na-asọ mpi mgbe niile nʼoge gara aga, ma onyenwe ya emeghị ihe ọbụla banyere ya, ọ ga-akwụzu ụgwọ ehi ahụ nwụrụ anwụ. Emesịa ehi ahụ nwụrụ anwụ ga-abụrụ nke ya.

Ọpụpụ — Chapters