[1] Abụ nke abụ nke Solomọn.
[2] Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
[3] Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
[4] Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
[5] Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
[6] Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
[7] Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
[8] Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
[9] Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
[10] Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
[11] Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
[12] Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
[13] Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.
[14] Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.
[15] Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.
[16] Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke. E, ị mara mma. Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
[17] Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.