[1] Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
[2] Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
[3] Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
[4] Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
[5] Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
[6] Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
[7] Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
[8] Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
[9] Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
[10] Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
[11] Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
[12] Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
[13] Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.
[14] Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
[15] Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
[16] Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
[17] Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
[18] Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
[19] Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
[20] Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.
[21] Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
[22] Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
[23] Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
[24] nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
[25] Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
[26] Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
[27] Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.